17Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu, unu ndị niile bi nʼụwa.
18Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu ga-adaba nʼolulu; onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya. Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu. Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.
19Ụwa adapịasịala; ụwa agbawasịala; e jirila oke ike nugharịa ụwa.
20Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu. Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị. Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ, nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya.
21Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ. Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ.