5Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa, ha bịa ka mụ na ha mee udo. E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.”
6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ. Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru, jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile.
7Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ dịka o si taa ndị iro ya. O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya dị ka e si gbuo ndị iro ha.
8Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ. Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ ka o ji bupụ ha.
9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb, nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya: Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha dịka ntụ, mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera, na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.