Aịzaya 28

Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe, maọbụ kpọree ụkwụ igwe nʼelu kumin, kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin, werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe.

Isaiah 28:27 (UKJV) For the fitches are not threshed with a threshing instrument, neither is a cart wheel turned about upon the cummin; but the fitches are beaten out with a staff, and the cummin with a rod.

25Mgbe o gwuzesịrị ya, ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin? Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya, ọka balị nʼebe o kwesiri, na spelti nʼebe o kwesiri?

26Ọ maara ihe o kwesiri ime, nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi.

27Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe, maọbụ kpọree ụkwụ igwe nʼelu kumin, kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin, werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe.

28A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ, ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya. E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha, ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha.

29Ihe ndị a niile na-esite nʼaka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-abịa, onye nzube ya dị ịtụnanya, onye amamihe ya dị ebube.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.