23Geenụ ntị, nụrụnụ olu m, ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu.
24Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ? Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla?
25Mgbe o gwuzesịrị ya, ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin? Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya, ọka balị nʼebe o kwesiri, na spelti nʼebe o kwesiri?
26Ọ maara ihe o kwesiri ime, nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi.
27Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe, maọbụ kpọree ụkwụ igwe nʼelu kumin, kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin, werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe.