1Nʼihi na, lee, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-akwado isite na Jerusalem na Juda wezuga ihe nnweta na ihe nkwado niile, ya na ihe oriri niile na mmiri ọṅụṅụ niile.
2Ọ ga-ewezugakwa ndị bụ dike nʼetiti ha, na onye agha, na onye ikpe, na onye amụma, na onye na-ajụ ase, na ndị okenye ha,
3na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ, na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ.