12Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu, “Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị, ma dabere na mmegbu na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ,
13mmehie a ga-aghọrọ unu ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa, nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.
14Ọ ga-etipịasị dịka ite aja, nke etipịara na-enweghị obi ebere, nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya, iji gụta ọkụ site na-ekwu, maọbụ kupụta mmiri site nʼite.”
15Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị, “Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu, na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị, ma unu ekweghị na nke ọbụla.
16Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’ E, unu ga-agba ọsọ nʼezie. Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’ Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa.