Aịzaya 30

Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada.

Isaiah 30:25 (UKJV) And there shall be upon every high mountain, and upon every high hill, rivers and streams of waters in the day of the great slaughter, when the towers fall.

23Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara.

24Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma.

25Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada.

26Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka.

27Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa! Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu. Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya, okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.