Aịzaya 30

Ma unu ga-abụ abụ dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ, obi unu ga-aṅụrị ọṅụ dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị, na-agakwuru Oke Nkume Izrel.

Isaiah 30:29 (UKJV) All of you shall have a song, as in the night when a holy solemnity is kept; and gladness of heart, as when one goes with a pipe to come into the mountain of the LORD, to the mighty One of Israel.

27Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa! Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu. Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya, okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ.

28Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ, nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu. Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi, ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ eriri igwe nke na-edufu ha.

29Ma unu ga-abụ abụ dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ, obi unu ga-aṅụrị ọṅụ dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị, na-agakwuru Oke Nkume Izrel.

30Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube, ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa, jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe.

31Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu; ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.