15Ndị na-ejegharị nʼezi omume na-ekwu ihe ziri ezi, ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi, ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche, ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara, na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ.
16Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha.
17Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya.
18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”
19Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa.