17Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya.
18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”
19Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa.
20Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile; anya unu ga-ahụkwa Jerusalem, ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ; apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya, maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.
21Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike. Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara. Ọ dịghị ụgbọ amara maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ.