20Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile; anya unu ga-ahụkwa Jerusalem, ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ; apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya, maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.
21Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike. Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara. Ọ dịghị ụgbọ amara maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ.
22Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ikpe anyị. Onyenwe anyị bụ onye na-enye anyị iwu. Onyenwe anyị bụ eze anyị, ọ bụ ya na-azọpụta anyị.
23A tọsaala ụdọ niile: Ha adịghị ejidesikwa ọkọlọtọ gị ike, a gbasaghịkwa akwa igbochi ifufe. Mgbe ahụ, a ga-ekesa ụba ihe a kwatara nʼagha ọ bụladị ndị ngwụrọ ga-ebute ihe nkwata nʼagha.
24Ọ dịkwaghị onye bi na Zayọn ga-asị, “Ahụ esighị m ike,” nʼihi na a ga-agbaghara ndị bi nʼime ya mmehie ha niile.