7Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile; ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa.
8Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla. E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire. A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike. Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ.
9Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu. Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere. Sharọn aghọkwaala ọzara; osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha.
10Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.” “Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu; ugbu a, ka a ga-ebuli m elu.
11Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, unu na-amụpụta ahịhịa, nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu.