Aịzaya 36

Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?”

Isaiah 36:12 (UKJV) But Rabshakeh said, Has my master sent me to your master and to you to speak these words? has he not sent me to the men that sit upon the wall, that they may eat their own dung, and drink their own piss with you?

10Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma ọ bụghị nkwado Onyenwe anyị? Onyenwe anyị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ”

11Mgbe ahụ Eliakịm, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.”

12Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?”

13Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa.

14Nke a bụ ihe eze sịrị, Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.