Aịzaya 37

Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.

Isaiah 37:14 (UKJV) And Hezekiah received the letter from the hand of the messengers, and read it: and Hezekiah went up unto the house of the LORD, and spread it before the LORD.

12Chi niile nke mba niile, ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden ndị nọ na Tel Asa?

13Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze ndị Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?”

14Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.

15Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị:

16“O, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.