Aịzaya 37

O zipụrụ Eliakịm, onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.

Isaiah 37:2 (UKJV) And he sent Eliakim, who was over the household, and Shebna the scribe, and the elders of the priests covered with sackcloth, unto Isaiah the prophet the son of Amoz.

1Mgbe eze Hezekaya nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

2O zipụrụ Eliakịm, onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.

3Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.

4Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ nke Rabashaka, bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.