27Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere, bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi, na ome na-epupụta epupụta, nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
28“Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ, marakwa ọpụpụ gị na mbata gị, marakwa oke iwe gị megide m.
29Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị, werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị, mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.
30“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama nye gị, Hezekaya. “Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi, kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
31Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.