Aịzaya 37

“Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ, marakwa ọpụpụ gị na mbata gị, marakwa oke iwe gị megide m.

Isaiah 37:28 (UKJV) But I know your abode, and your going out, and your coming in, and your rage against me.

26“Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya, ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.

27Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere, bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi, na ome na-epupụta epupụta, nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.

28“Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ, marakwa ọpụpụ gị na mbata gị, marakwa oke iwe gị megide m.

29Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị, werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị, mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.

30“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama nye gị, Hezekaya. “Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi, kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.