31Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
32Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta, otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezu nke a.
33“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa. “Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.
34Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
35“Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.”