7“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.
8Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.
9Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:
10Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ, bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?”
11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ nʼala ndị dị ndụ, m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ, maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.