1Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi, ka Chineke gị kwuru.
2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya; na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla, na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile, na o sitela nʼaka Onyenwe anyị nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile.
3Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị.