21Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa?
22Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu. Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana. Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa, were ya mere ebe obibi ya.
23Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa, mee ha ka ha ghọọ ihe efu.
24Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute. Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute, mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala, mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha, bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
25“Olee onye unu ga-eji tụnyere m? Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ.