6Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa.
7Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ.
8E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa, ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.”
9Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn, rigoro nʼelu ugwu; gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem, welie olu gị elu tisie mkpu ike; e, tisie mkpu ike, atụla egwu. Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha: “Chineke unu na-abịa.”
10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ.