Aịzaya 42

Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.”

Isaiah 42:9 (UKJV) Behold, the former things are come to pass, and new things do I declare: before they spring forth I tell you of them.

7Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha.

8“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m. Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m. Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m.

9Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.”

10Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya, unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa, unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya. Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu.

11Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu, ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ. Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.