Aịzaya 43

“Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu. Ana m emekwa ya nʼihi na ọ dị m mma nʼobi ime ya. Agakwaghị m echeta mmehie unu ọzọ.

Isaiah 43:25 (UKJV) I, even I, am he that blots out your transgressions for mine own sake, and will not remember your sins.

23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ, maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m. O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka, maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ.

24Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ, maọbụ were abụba anụ nke aja unu niile mee ka obi tọọ m ụtọ. Kama ọ bụ naanị mmehie unu ka unu na-ebokwasị m, unu ejirila ajọ omume unu mee ka ike gwụsịa m.

25“Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu. Ana m emekwa ya nʼihi na ọ dị m mma nʼobi ime ya. Agakwaghị m echeta mmehie unu ọzọ.

26Chetara m ihe gara aga, ka anyị rụrịta ụka nʼetiti onwe anyị, doo okwu gị nʼusoro igosi na ị bụ onye ikpe na-amaghị.

27Site na mmalite, nna nna unu ha mehiere megide m. Ndị m dunyere ka ha kuziere unu ihe nupukwara isi megide m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.