25onye na-emebi ihe ịrịbama niile nke ndị amụma ụgha na-emekwa ka ndị na-ajụta ase ghọọ ndị nzuzu, onye na-ekpu ihe ọmụmụ ndị maara ihe ihu nʼala tụgharịa ya, ha ghọọ ihe nzuzu,
26onye na-eme ka okwu ndị ohu ya mezuo meekwa ka amụma ndị ozi ya buru mezuo, onye na-asị banyere Jerusalem, ‘A ga-ebikwa nʼime ya ọzọ,’ na-asịkwa banyere obodo niile nke Juda, ‘A ga-ewughachi ha,’ banyere mkpọmkpọ ebe ha niile, ‘Aga m ewulikwa ha.’
27Onye ahụ na-asị, ogbu mmiri, ‘Takọrọ, aga m emekwa ka iyi ya niile takọrọsịa,’
28Onye na-asị banyere Sairọs, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-emezukwa ihe niile na-adị m mma; Ọ ga-asịkwa banyere Jerusalem, “Ka ewugharịa ya,” ma banyere ụlọnsọ, “Ka ehiwe ntọala ya.” ’