2Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ, na onye ga-enyere unu aka: Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.
3Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri, mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ. Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m, meekwa ka ngọzị m dịrị ha.
4Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri, e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri.
5Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’ maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’ ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’ ha ga-agụkwa onwe ha Izrel.
6“Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile: Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m.