12Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
13Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.
14Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke.
15Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu, na ndị dị ala, ndị mpako ka a ga-eweda nʼala.
16Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.