1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Olee ebe akwụkwọ m ji gbaa nne unu alụkwaghị m dị bụ nke m ji chụpụ ya? Ma ọ bụ onye nʼime ndị m ji ụgwọ ka m resiri unu? Ọ bụ nʼihi mmehie unu ka e ji ree unu; nʼihi mmebi iwu unu ka e jiri chụọ nne unu.
2Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara? Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku? Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu? Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta? Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ. Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara, ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ nʼihi enweghị mmiri.
3Ọ bụ mụ bụ onye ahụ na-eme ka ọchịchịrị kpuchie ihu eluigwe, ka ihu eluigwe dịrị ka ihu onye na-eru ụjụ.”
4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.
5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ, ma enupughị m isi, a tụgharịkwaghị m azụ.