Aịzaya 50

Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha.

Isaiah 50:9 (UKJV) Behold, the Lord GOD will help me; who is he that shall condemn me? lo, they all shall wax old as a garment; the moth shall eat them up.

7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m.

8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya.

9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha.

10Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya? Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị, nke na-enweghị ìhè ọbụla, tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyị daberekwa na Chineke ha.

11Ma lee, unu niile ndị na-amụnye ọkụ, ndị meere onwe ha ọwaọkụ, nke unu ji na-ejegharị nʼọchịchịrị, gaanụ nʼihu na-ejegharị nʼìhè ọkụ ahụ unu mụnyeere onwe unu. Ihe unu ga-anata site nʼaka Onyenwe anyị bụ ihe mwute nke ga-abịakwasị unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.