Aịzaya 51

Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.

Isaiah 51:11 (UKJV) Therefore the redeemed of the LORD shall return, and come with singing unto Zion; and everlasting joy shall be upon their head: they shall obtain gladness and joy; and sorrow and mourning shall flee away.

9Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka Onyenwe anyị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ?

10Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa? Mmiri ahụ dị omimi. Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya, ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee?

11Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.

12“Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa,

13na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu, onye na-esetipụ eluigwe, onye tọkwara ntọala niile nke ụwa; na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ, onye nke kpebiri ibibi unu? Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.