7A kpagburu ya, mesie ya ihe ike, ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta. E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị, otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya.
8Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya. Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ ya weliri olu kwuo okwu? Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ; maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.
9E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu, ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya, ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere, ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta.
10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ. Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie. Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge. Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya.
11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ, ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya, site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume, ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.