9E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu, ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya, ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere, ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta.
10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ. Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie. Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge. Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya.
11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ, ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya, site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume, ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.
12Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba, ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha, nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ, a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ, rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.