1“Bụọ abụ, gị nwanyị aga, gị onye na-amụtaghị nwa; tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ, gị onye ime nwa na-emetụbeghị; nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
2“Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara, gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị, egbochila gbasapụ aka; mee ka ụdọ gị dị ogologo, meekwa ka o sie ike nke ọma.
3Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa; ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha, bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu.
4“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.