1Ndị ezi omume na-ala nʼiyi, ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi; a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ma ọ dịghị onye na-aghọta, na-ewezugara onye ezi omume pụọ nʼihu ihe ọjọọ.
2Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha na-abanye nʼudo. Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.
3“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị, unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.