Aịzaya 57

Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị. Ikuku ga-eburu ha niile bufuo, naanị otu nkuume ga-ekutu ha. Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ ga-eketa ala ahụ; ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”

Isaiah 57:13 (UKJV) When you cry, let your companies deliver you; but the wind shall carry them all away; vanity shall take them: but he that puts his trust in me shall possess the land, and shall inherit my holy mountain;

11“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a? Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu? Ị naghị echetakwa m, ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị? Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile ka i ji hapụ ịtụ m egwu?

12Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị, igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.

13Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị. Ikuku ga-eburu ha niile bufuo, naanị otu nkuume ga-ekutu ha. Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ ga-eketa ala ahụ; ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”

14A ga-asịkwa, “Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma. Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”

15Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.