12Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile. Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie. A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada, ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi.
13“Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ, sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m, ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị na ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu, ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị, na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ,
14mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị, m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ, meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.