Aịzaya 58

Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.

Isaiah 58:7 (UKJV) Is it not to deal your bread to the hungry, and that you bring the poor that are cast out to your house? when you see the naked, that you cover him; and that you hide not yourself from yours own flesh?

5Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara, naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala? Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara, nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ? Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ, ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara?

6“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla?

7Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.

8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ.

9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.