6“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla?
7Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.
8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ.
9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị,
10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie.