8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ.
9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị,
10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie.
11Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile. Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ, meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike. Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma, dịka isi iyi na-adịghị ata ata.
12Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile. Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie. A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada, ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi.