Aịzaya 59

Kama mmehie unu ekewapụla unu site nʼebe Chineke unu nọ; mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ, nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ.

Isaiah 59:2 (UKJV) But your iniquities have separated between you and your God, and your sins have hid his face from you, that he will not hear.

1Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta, ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe.

2Kama mmehie unu ekewapụla unu site nʼebe Chineke unu nọ; mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ, nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ.

3Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara, mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ. Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha, ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.

4Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe. Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha, ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.