3Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara, mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ. Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha, ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.
4Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe. Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha, ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe.
5Ha na-avụ akwa ajụala, na-akpakwa akwụ udide. Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ, mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta.
6Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe, ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha. Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ, omume ihe ike jupụtara ha nʼaka.
7Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.