12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha.
13“Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị. Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres, ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma. Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile.
14Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị. Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ. Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị, Zayọn nke Onye nsọ Izrel.
15“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị.
16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.