9Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya, tookwa Onyenwe anyị, ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya nʼime ogige ebe nsọ m.”
10Gabiganụ! Gabiganụ sitenụ nʼọnụ ụzọ ama niile. Dozienụ ụzọ maka ndị m. Wuzienụ ụzọ niile, wuzienụ okporoụzọ niile. Bupụsịanụ nkume niile, weliekwanụ ọkọlọtọ maka mba niile.
11Onyenwe anyị ekwusaala okwu nye nsọtụ niile nke ụwa sị, “Gwanụ Ada Zayọn, ‘Lee Onye Nzọpụta gị na-abịa! Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, nkwụghachi nke ọ ga-akwụghachi sokwa ya na-abịa.’ ”
12A ga-akpọ ha Ndị Nsọ, ndị Onyenwe anyị gbapụtara; a ga-akpọkwa unu ndị a na-achọsi ike, Obodo a na-agbakụtaghị azụ.