4A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị Hefziba, kpọkwa ala gị Beula, nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye.
5Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, otu a ka Onye na-ewu gị ga-alụ gị, dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ, otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.
6Enyela m ndị nche ọnọdụ ọrụ nʼelu mgbidi gị niile, Jerusalem. Ha agaghị edebe ọnụ ha duu mgbe ọbụla, ma ehihie ma abalị. Unu ndị na-akpọku Onyenwe anyị, unu enyela onwe unu izuike.
7Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike, meekwa ya otuto nke ụwa niile.
8Onyenwe anyị ewerela aka nri ya werekwa ogwe aka ya ṅụọ iyi sị, “Ọ dịghịkwa mgbe m ga-enye mkpụrụ ubi gị ka ọ bụrụ nri nye ndị iro gị ọzọ, ọ dịghịkwa mgbe ndị ọbịa ga-aṅụkwa mmanya ọhụrụ ahụ bụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ya.