6Enyela m ndị nche ọnọdụ ọrụ nʼelu mgbidi gị niile, Jerusalem. Ha agaghị edebe ọnụ ha duu mgbe ọbụla, ma ehihie ma abalị. Unu ndị na-akpọku Onyenwe anyị, unu enyela onwe unu izuike.
7Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike, meekwa ya otuto nke ụwa niile.
8Onyenwe anyị ewerela aka nri ya werekwa ogwe aka ya ṅụọ iyi sị, “Ọ dịghịkwa mgbe m ga-enye mkpụrụ ubi gị ka ọ bụrụ nri nye ndị iro gị ọzọ, ọ dịghịkwa mgbe ndị ọbịa ga-aṅụkwa mmanya ọhụrụ ahụ bụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ya.
9Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya, tookwa Onyenwe anyị, ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya nʼime ogige ebe nsọ m.”
10Gabiganụ! Gabiganụ sitenụ nʼọnụ ụzọ ama niile. Dozienụ ụzọ maka ndị m. Wuzienụ ụzọ niile, wuzienụ okporoụzọ niile. Bupụsịanụ nkume niile, weliekwanụ ọkọlọtọ maka mba niile.