Aịzaya 63

“Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya; o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka. Azọchara m ha nʼiwe m, zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m; ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m, ma metọsịa uwe m niile.

Isaiah 63:3 (UKJV) I have trodden the winepress alone; and of the people there was none with me: for I will tread them in mine anger, and trample them in my fury; and their blood shall be sprinkled upon my garments, and I will stain all my raiment.

1Onye bụ onye a si nʼEdọm na-abịa, onye si Bozra, nke uwe ya dị ọbara ọbara? Onye bụ onye a, yi uwe mara oke mma, onye na-azọ ije dịka ịba ụba nke ike ya si dị? “Ọ bu mụ onwe m, onye na-ekwu okwu nʼezi omume, onye dị ike ịzọpụta!”

2Gịnị mere uwe gị ji na-acha ọbara ọbara, dịka uwe onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị?

3“Azọchaala m ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị, naanị m zọchara ya; o nweghị onye sị na mba niile dị iche iche bịa nyere m aka. Azọchara m ha nʼiwe m, zọpịasịakwa ha nʼime oke ọnụma m; ọbara ha gbasasịrị nʼuwe m, ma metọsịa uwe m niile.

4Nʼihi na ọ bụ ụbọchị m ji abọ ọbọ; afọ mgbapụta m kwadoro eruola.

5Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka. O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka. Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri. Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.