11Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ. Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ, ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”
12Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri, mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke. Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya, wugharịakwa gị nʼikpere ya.
13Dịka nne si akasị nwa ya obi, otu a ka m ga-esi kasịe unu obi. Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”
14Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ, ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ; a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ, ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.
15Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa. Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe. Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya, werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.