23Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke.
24Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ.
25Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị.