Aịzaya 7

Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ.

Isaiah 7:24 (UKJV) With arrows and with bows shall men come thither; because all the land shall become briers and thorns.

22Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ.

23Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke.

24Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ.

25Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.