6“Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.”
7Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ọ gaghị adị ire! Ọ gaghị emezukwa.
8Nʼihi isi obodo Aram bụ Damaskọs. Onyeisi Damaskọs bụ naanị Rezin. Ma tupu afọ iri isii na ise agafee a ga-etikpọkwa Ifrem.
9Isi obodo Ifrem bụ Sameria. Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya. Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu, unu agaghị eguzo ma ọlị.’ ”
10Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị,